25“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’
26Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?
27Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.
28Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
29“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”