Jeremaya 23

Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.

Jeremiah 23:6 (UKJV) In his days Judah shall be saved, and Israel shall dwell safely: and this is his name whereby he shall be called, THE LORD OUR RIGHTEOUSNESS.

4Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.

6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.

7“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’

8ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.