Jeremaya 23

Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Jeremiah 23:4 (UKJV) And I will set up shepherds over them which shall feed them: and they shall fear no more, nor be dismayed, neither shall they be lacking, says the LORD.

2Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

3“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.

4Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.

6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.