Jeremaya 25

Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.

Jeremiah 25:13 (UKJV) And I will bring upon that land all my words which I have pronounced against it, even all that is written in this book, which Jeremiah has prophesied against all the nations.

11Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.

12“Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.

13Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.

14A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”

15Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.