24Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara;
25na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia;
26na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa. Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ.
27“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
28Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.