5Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.
6Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.
7“Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”
8Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.
9Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.