Jeremaya 27

Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi.

Jeremiah 27:10 (UKJV) For they prophesy a lie unto you, to remove you far from your land; and that I should drive you out, and all of you should perish.

8“ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

9Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’

10Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi.

11Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” ’ ”

12Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.