11Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” ’ ”
12Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.
13Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn?
14Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu.
15‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’ ”