9Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
10Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.
11Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka Onyenwe anyị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
12Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị.
13Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.