Jeremaya 29

Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 29:9 (UKJV) For they prophesy falsely unto you in my name: I have not sent them, says the LORD.

7Chọọnụ udo nke obodo ahụ m mere ka unu gaa biri nʼime ya. Kpeekwanụ ekpere nye Onyenwe anyị banyere ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ihe agaara obodo ahụ nke ọma, ọ ga-agakwara unu nke ọma.”

8Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru, “Unu ekwela ka ndị amụma ahụ nọ nʼetiti unu, na ndị na-ajụ arụsị ase rafuo unu; unu egela ntị nʼakụkọ ha na-akọ banyere nrọ ndị ahụ unu na-akwagide ha ka ha rọọ.

9Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

10Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.

11Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka Onyenwe anyị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.