16Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ.
17Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha.
18Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”
19“Mụ onwe m kwuru sị, “ ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.
20Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.