Jeremaya 3

Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 3:20 (UKJV) Surely as a wife treacherously departs from her husband, so have all of you dealt treacherously with me, O house of Israel, says the LORD.

18Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”

19“Mụ onwe m kwuru sị, “ ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.

20Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

21A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu. Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie; ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.

22“Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.” Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.