Jeremaya 3

Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.

Jeremiah 3:9 (UKJV) And it came to pass through the levity of her whoredom, that she defiled the land, and committed adultery with stones and with stocks.

7Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya.

8Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.

9Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.

10Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.