10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.
12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha, dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.
13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
14Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta, afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.