23Ha batara nʼala a, nweta ya, ma ha jụrụ irubere gị isi, maọbụ jegharịa nʼiwu gị; ha emeghị ihe ndị i nyere ha nʼiwu mee. Nʼihi ya, i mere ka ihe ọjọọ ndị a bịakwasị ha.
24“Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a.
25Ma ọ bụ ezie na a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, ma gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gwara m sị, ‘Were ọlaọcha zụta ala ahụ. Zụkwaa ya nʼihu ndị akaebe.’ ”
26Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
27“Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime?