28Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ejikerela m ugbu a inyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, na nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, onye ga-alụta ya nʼagha.
29Ndị Babilọn ahụ na-ebuso obodo a agha, ga-abata nʼime ya, kpọọ ya ọkụ. Ha ga-akpọ ya ọkụ, ya na ụlọ niile dị nʼime ya, bụ ụlọ niile ahụ ndị bi nʼime ya nọ kpasuo m iwe, site nʼisure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi Baal nʼelu ụlọ ha niile, na site nʼịwụsara chi ndị ọzọ onyinye ihe ọṅụṅụ.
30“Ọ bụ naanị ihe ọjọọ ka ndị Izrel na ndị Juda mere nʼihu m site na mgbe ha bụ nwantakịrị. Nʼezie, ha esitela nʼihe ha ji aka mee kpasuo m iwe, ka Onyenwe anyị kwuru.
31Site nʼoge e wuru ya ruo ugbu a, ndị bi nʼobodo a akpaliela iwe m na ọnụma m. Ya mere, aga m esite nʼihu m wezuga ha.
32Ndị Izrel na Juda, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, na ndị nchụaja ha, na ndị amụma ha, na ndị ikom Juda, ma ndị bi na Jerusalem, akpasuola m iwe site nʼihe ọjọọ niile ha mere.