35Ha wuru ebe dị elu dị iche iche na Ndagwurugwu nke Ben Hinom nye Baal, ebe ha nọ jiri ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọ aja nye Molek. O nweghị mgbe m nyere ha iwu ime ihe dị otu a, o nweghị mgbe ajọ ihe dị otu a batara m nʼobi, nke i nye ha iwu ime ihe arụ dị otu a, nke ime ka Juda mehie.
36“Ihe i kwuru banyere obodo a bụ, ‘A ga-esite na mma agha, na nʼụnwụ, na nʼoke ọrịa, nyefee ha nʼaka eze Babilọn,’ ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru,
37Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo.
38Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
39Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha.