33Ha gbakụtara m azụ, jụ ilenye anya nʼebe m nọ. Ọ bụ ezie na m ziri ha ihe mgbe mgbe, ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ịnabata ịdọ aka na ntị m.
34Ha doro oyiyi ihe arụ nʼụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m, si otu a merụọ ya.
35Ha wuru ebe dị elu dị iche iche na Ndagwurugwu nke Ben Hinom nye Baal, ebe ha nọ jiri ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọ aja nye Molek. O nweghị mgbe m nyere ha iwu ime ihe dị otu a, o nweghị mgbe ajọ ihe dị otu a batara m nʼobi, nke i nye ha iwu ime ihe arụ dị otu a, nke ime ka Juda mehie.
36“Ihe i kwuru banyere obodo a bụ, ‘A ga-esite na mma agha, na nʼụnwụ, na nʼoke ọrịa, nyefee ha nʼaka eze Babilọn,’ ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru,
37Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo.