24“Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.
25Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na m emeghị ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti mụ na ehihie na abalị, meekwa ka iwu na-achị eluigwe na ụwa guzosie ike,
26mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’ ”