Jeremaya 33

“ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.

Jeremiah 33:6 (UKJV) Behold, I will bring it health and cure, and I will cure them, and will reveal unto them the abundance of peace and truth.

4Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha

5nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.

6“ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.

7Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ.

8Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.