Jeremaya 34

“Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa.

Jeremiah 34:17 (UKJV) Therefore thus says the LORD; All of you have not hearkened unto me, in proclaiming liberty, every one to his brother, and every man to his neighbour: behold, I proclaim a liberty for you, says the LORD, to the sword, to the pestilence, and to the famine; and I will make you to be removed into all the kingdoms of the earth.

15Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m.

16Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ.

17“Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa.

18Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike.

19Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.