14‘Jehonadab nwa Rekab nyere ụmụ ụmụ ya iwu sị ha aṅụla mmanya, ha na-edebe iwu ahụ. Ruo taa, ha adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu mgbe na mgbe, ma unu jụrụ irubere m isi.
15Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.
16Ụmụ ụmụ Jehonadab, nwa Rekab, emeela ihe nna nna ha nyere ha nʼiwu, ma ndị a jụrụ irubere m isi.’
17“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ”
18Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị ezinaụlọ Rekab, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Unu erubeela isi mee ihe niile nna nna unu bụ Jehonadab nyere unu nʼiwu.’