15Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.
16Ụmụ ụmụ Jehonadab, nwa Rekab, emeela ihe nna nna ha nyere ha nʼiwu, ma ndị a jụrụ irubere m isi.’
17“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ”
18Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị ezinaụlọ Rekab, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Unu erubeela isi mee ihe niile nna nna unu bụ Jehonadab nyere unu nʼiwu.’
19Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru sị, ‘O nweghị mgbe ọbụla nwoke ga-ejere m ozi ga-akọ nʼezinaụlọ Jehonadab nwa Rekab.’ ”