Jeremaya 35

Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’

Jeremiah 35:7 (UKJV) Neither shall all of you build house, nor sow seed, nor plant vineyard, nor have any: but all your days all of you shall dwell in tents; that all of you may live many days in the land where all of you be strangers.

5Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”

6Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu.

7Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’

8Anyị erubela isi nʼihe niile nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab gwara anyị. Anyị na ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom adịghị aṅụ mmanya,

9maọbụ wuo ụlọ, maọbụ nwee ubi vaịnị, ala ubi maọbụ mkpụrụ ọkụkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.