Jeremaya 35

Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”

Jeremiah 35:5 (UKJV) And I set before the sons of the house of the Rechabites pots full of wine, and cups, and I said unto them, Drink all of you wine.

3Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile.

4Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ.

5Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”

6Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu.

7Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.