1Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya,
2“Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.”
3Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile.
4Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ.
5Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”