Jeremaya 36

Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu Onyenwe anyị nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta,

Jeremiah 36:11 (UKJV) When Michaiah the son of Gemariah, the son of Shaphan, had heard out of the book all the words of the LORD,

9Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem.

10Baruk nọ nʼọnụụlọ Gemaraya nwa Shefan, bụ ode akwụkwọ, gụpụtara ndị niile nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu Jeremaya, nke dị nʼakwụkwọ a dị nsọ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke ụlọnsọ ahụ.

11Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu Onyenwe anyị nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta,

12o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ.

13Mgbe Mikaya gwara ha ihe ọ nụrụ Baruk si nʼakwụkwọ ahụ gụpụtara ndị mmadụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.