11Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu Onyenwe anyị nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta,
12o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ.
13Mgbe Mikaya gwara ha ihe ọ nụrụ Baruk si nʼakwụkwọ ahụ gụpụtara ndị mmadụ,
14ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha.
15Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ha gwara ya sị ya, “Biko, nọdụ ala gụọra anyị ihe dị nʼakwụkwọ a.” Ya mere, Baruk gụpụtara ha ihe dị nʼakwụkwọ ahụ.