18Baruk zara sị ha, “E, ọ bụ ya kpọpụtara m okwu ndị a niile m deturu. E ji m inki dee ha nʼakwụkwọ.”
19Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.”
20Mgbe ha zochasịrị akwụkwọ ahụ nʼọnụụlọ Elishama onye ode akwụkwọ, ha jekwuuru eze nʼogige ụlọ ya kọọrọ ya ihe niile.
21Eze ziri Jehudi ka ọ gaa weta akwụkwọ ahụ. Mgbe Jehudi wetara ya site nʼọnụụlọ Elishama, ode akwụkwọ, ọ gụrụ ya nʼihu eze, na nʼihu ndịisi ọchịchị ahụ niile guzo nʼakụkụ eze.
22Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya.