27Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya:
28“Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ.
29Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”
30Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim eze Juda; Ọ gaghị amụta onye ga-anọ nʼocheeze Devid. Ọzọ, a ga-atụfu ozu ya nʼebe igirigi nke abalị ga-adakwasị ya, ebe okpomọkụ nke ehihie ga-erute ya.
31Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’ ”