Jeremaya 36

Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.”

Jeremiah 36:3 (UKJV) It may be that the house of Judah will hear all the evil which I purpose to do unto them; that they may return every man from his evil way; that I may forgive their iniquity and their sin.

1Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu Onyenwe anyị ndị a ruru Jeremaya ntị,

2“Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a.

3Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.”

4Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile Onyenwe anyị gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ.

5Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.