4Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile Onyenwe anyị gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ.
5Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
6Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ.
7Ma eleghị anya, ha ga-arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Ma eleghị anya onye ọbụla nʼime ha ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa, ka iwe na ọnụma dị ukwuu nke Onyenwe anyị ga-ekpughe megide ndị a ghara ịbịakwasị ha.”
8Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu Onyenwe anyị, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.