Jeremaya 37

Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’

Jeremiah 37:19 (UKJV) Where are now your prophets which prophesied unto you, saying, The king of Babylon shall not come against you, nor against this land?

17Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka Onyenwe anyị?” Jeremaya zara sị ya, “E, lee, a ga-arara gị nyefee gị nʼaka eze Babilọn.”

18Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ?

19Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’

20Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”

21Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.