4Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ.
5Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.
6Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya,
7“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt.
8Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’