1Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha,
2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’
3Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ”