Jeremaya 38

“Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere Onyenwe anyị isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị.

Jeremiah 38:20 (UKJV) But Jeremiah said, They shall not deliver you. Obey, I plead to you, the voice of the LORD, which I speak unto you: so it shall be well unto you, and your soul shall live.

18Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ”

19Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.”

20“Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere Onyenwe anyị isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị.

21Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ:

22A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.