25Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’
26mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’ ”
27Ndịisi ọchịchị ahụ niile bịakwutere Jeremaya jụọ ya ajụjụ. Ọ gwakwara ha ihe ahụ niile eze nyere ya nʼiwu. Ha hapụrụ ịjụ ya ihe ọzọ, nʼihi o nwekwaghị onye ọzọ nụrụ okwu niile ya na eze kwuru.
28Jeremaya nọgidekwara nʼogige ndị nche tutu ruo ụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. Otu a ka esi were Jerusalem.