1Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya.
2Nʼụbọchị nke itoolu, nʼọnwa nke anọ, nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, ha gwupuru mgbidi obodo ahụ.
3Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.