Jeremaya 39

“Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”

Jeremiah 39:12 (UKJV) Take him, and look well to him, and do him no harm; but do unto him even as he shall say unto you.

10Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile.

11Ugbu a, Nebukadneza eze Babilọn enyelarị Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze iwu banyere Jeremaya, sị,

12“Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”

13Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn,

14ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.