9Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, buuru ndị niile fọdụrụ nʼobodo, ha na ndị ahụ buuru ụzọ jekwuru ya, na ndị ọzọ fọdụrụ, bulaa ha Babilọn, dịka ndị a dọtara nʼagha.
10Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile.
11Ugbu a, Nebukadneza eze Babilọn enyelarị Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze iwu banyere Jeremaya, sị,
12“Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”
13Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn,