4Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.
5Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe.
6Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ.
7Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn.
8Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem.