6Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ.
7Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn.
8Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem.
9Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, buuru ndị niile fọdụrụ nʼobodo, ha na ndị ahụ buuru ụzọ jekwuru ya, na ndị ọzọ fọdụrụ, bulaa ha Babilọn, dịka ndị a dọtara nʼagha.
10Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile.