Jeremaya 40

ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha.

Jeremiah 40:8 (UKJV) Then they came to Gedaliah to Mizpah, even Ishmael the son of Nethaniah, and Johanan and Jonathan the sons of Kareah, and Seraiah the son of Tanhumeth, and the sons of Ephai the Netophathite, and Jezaniah the son of a Maachathite, they and their men.

6Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri.

7Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ,

8ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha.

9Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn: birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.

10Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.