Jeremaya 41

Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri,

Jeremiah 41:1 (UKJV) Now it came to pass in the seventh month, that Ishmael the son of Nethaniah the son of Elishama, of the seed royal, and the princes of the king, even ten men with him, came unto Gedaliah the son of Ahikam to Mizpah; and there they did eat bread together in Mizpah.

1Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri,

2Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile.

3Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.