Jeremaya 41

Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya,

Jeremiah 41:4 (UKJV) And it came to pass the second day after he had slain Gedaliah, and no man knew it,

2Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile.

3Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ.

4Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya,

5o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

6Ishmel nwa Netanaya sitere na Mizpa pụọ izute ha, na-akwa akwa mgbe ọ na-aga. Mgbe o zutere ha, ọ sịrị ha, “Bịakwutenụ Gedaliya nwa Ahikam.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.