Jeremaya 41

Ma mmadụ iri nʼime ndị ahụ gwara Ishmel okwu sị ya, “Biko, egbula anyị, nʼihi na anyị nwere ọka wiiti na ọka balị, na mmanụ aṅụ anyị zoro nʼime ọhịa.” Nʼihi ya, o gbughị ha, kama ọ hapụrụ ha ndụ.

Jeremiah 41:8 (UKJV) But ten men were found among them that said unto Ishmael, Slay us not: for we have treasures in the field, of wheat, and of barley, and of oil, and of honey. So he ceased, and slew them not among their brethren.

6Ishmel nwa Netanaya sitere na Mizpa pụọ izute ha, na-akwa akwa mgbe ọ na-aga. Mgbe o zutere ha, ọ sịrị ha, “Bịakwutenụ Gedaliya nwa Ahikam.”

7Mgbe ha batara nʼobodo, Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom ahụ bụ ndị so ya, gburu ndị ahụ tụnye ozu ha nʼime olulu.

8Ma mmadụ iri nʼime ndị ahụ gwara Ishmel okwu sị ya, “Biko, egbula anyị, nʼihi na anyị nwere ọka wiiti na ọka balị, na mmanụ aṅụ anyị zoro nʼime ọhịa.” Nʼihi ya, o gbughị ha, kama ọ hapụrụ ha ndụ.

9Olulu ahụ Ishmel tụnyere ozu Gedaliya na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke Asa bụ eze gwuru maka ichebe Jerusalem mgbe Baasha eze Izrel na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka Ishmel, nwa Netanaya kpojuru nʼime olulu ahụ.

10Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.