8Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
9Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị:
10‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu.
11Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya.
12Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’