15mgbe ahụ, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị fọdụrụ na Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike na mkpebi unu ịga Ijipt ibiri nʼebe ahụ, ọ bụrụkwa na unu agaa biri nʼIjipt nʼeziokwu,
16mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ.
17Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’
18Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’
19“Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị,