11Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.
12Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ.
13Nʼime ụlọnsọ anyanwụ dị nʼIjipt, ka ọ ga-akwatu ogidi nsọ niile, surekwaa ụlọnsọ niile nke chi dị iche iche nʼIjipt ọkụ.’ ”