Jeremaya 43

Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.

Jeremiah 43:4 (UKJV) So Johanan the son of Kareah, and all the captains of the forces, and all the people, obeyed not the voice of the LORD, to dwell in the land of Judah.

2Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,

3Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”

4Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.

5Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.

6Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.